Isaiah 63

Ụbọchị ịbọ ọbọ na mgbapụta nke Chineke

1Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa,
onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara?
Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma,
onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị?

“Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume,
Maọbụ, mmeri

onye dị ike ịzọpụta!”

2Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara,
dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị?

3“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya;
o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka.
Azọchara m ha nʼiwe m,
zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m;
ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m,
ma metọsịa uwe m niile.
4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ;
afọ mgbapụta m kwadoro eruola.
5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka.
O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka.
Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri.
Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
6Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche;
esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha.
Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”

Ekpere na otuto

7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị.
Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere.
Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ,
e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel,
nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m;
e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.”
Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.
9Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya,
ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha.
Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha,
bulie ha elu, kuru ha
ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.
10Ma ha nupuru isi megide ya,
meekwa ka obi jọọ Mmụọ Nsọ ya njọ.
Ọ bụ ya mere o ji ghọọ onye iro ha,
lụsokwa ha ọgụ nʼonwe ya.

11Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga,
ụbọchị Mosis na ndị nke ya.
Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta,
ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya?
Olee ebe onye ahụ tinyere
Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ.
12Olee onye ahụ ike ya
mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha,
mgbe Mosis weliri aka ya elu,
meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?
13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi?
Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara,
ike agwụghị ha.
14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu,
Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike.
Otu a ka i si duo ndị gị,
ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ.

15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe,
ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya.
Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị?
Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa?
16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị,
a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị
maọbụ Izrel agọnarị anyị,
gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị,
onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.
17 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo
na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị?
Lọghachi nʼihi ndị ohu gị,
nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị.
18Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị,
ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị.
19Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie,
ma ị naghị achị nʼebe ha nọ,
ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị.
Copyright information for IboBIU